Judges 16:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n'elu isim; n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m'bu site n'afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n'arum wezuga onwe-ya, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”