Judges 16:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m'di ike nání otù ub͕ò a, ka m'bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n'aru ndi Filistia n'ihi anyam abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”