Judges 16:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.