Judges 16:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa.