Judges 19:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.