Judges 2:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.