Judges 20:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?” Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ.