Judges 20:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị.