Judges 3:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab.