Judges 3:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ya onwe-ya si n'arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m'nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n'ebe ọ nọ pua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.