Judges 4:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n'aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n'akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n'ala; n'ihi na nwoke ahu di n'oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.