Judges 5:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.