Judges 6:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Gidiọn duuru mmadụ iri site na ndị na-ejere ya ozi, ndị nyeere ya aka imezu ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Kama, site nʼegwu maka ndị ikwu nna ya, na ndị bi nʼobodo ahụ, o mere ihe ndị a niile nʼime abalị.