Judges 7:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.”