Judges 7:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”