Judges 7:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.