Judges 8:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.