Judges 9:28 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?