Judges 9:48 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”