Lamentations 1:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide: Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um: Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.