Lamentations 1:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.