Lamentations 1:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua: Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri, Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.