Lamentations 2:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion; O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo: O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.