Lamentations 4:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara: Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.