Leviticus 1:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.