Leviticus 1:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.