Leviticus 10:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.