Leviticus 10:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.