Leviticus 11:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.