Leviticus 13:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n'ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
onye nchụaja ga-elezi onye dị otu a anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ọnya ahụ dị na-acha ọcha, maọbụ na ọnya ahụ mibara ime karịa, ọ ghọọla ekpenta nke si nʼọnya ahụ nupụta. Onye nchụaja ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ekpenta.