Leviticus 13:34 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-elezi ọnya ahụ anya. Ọ bụrụ na ọ basaghị karịa, maọbụ mibanye nʼime karịa anụ ahụ, a ga-agụ mmadụ ahụ dịka onye dị ọcha. Ọ ga-apụ sachaa uwe ya, bụrụ onye dị ọcha.