Leviticus 13:52 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-akpọ uwe ahụ, maọbụ akwa ajị anụ ahụ, maọbụ akwa ajị anụ a kpara akpa, maọbụ akwa ogho ọcha ahụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla ọkụ, nʼihi na ọrịa na-efe efe dị nʼime ya, nʼihi na ọrịa na-eweta mbibi ka ọ bụ. A ghakwaghị iji ọkụ rechapụ ya.