Leviticus 13:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe abalị asaa nke a gafekwara, onye nchụaja ga-elekwa ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dịtụla ya mma, na ọnya ahụ agbasaghị nʼanụ ahụ ya, onye nchụaja ga-asị na ọ dị ọcha, nʼihi na ọ bụ naanị ọnya efu. Onye ahụ ga-asakwa uwe ya mmiri, mgbe ahụ dị ọcha.