Leviticus 14:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.