Leviticus 14:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.