Leviticus 16:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.