Leviticus 17:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.