Leviticus 18:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.