Leviticus 22:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,