Leviticus 22:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,