Leviticus 23:37 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
(“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.