Leviticus 25:35 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.