Leviticus 27:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.