Leviticus 3:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.