Leviticus 4:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n'iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.