Leviticus 7:34 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”