Luke 1:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Zakaraya banyere ịchụ aja ahụ, igwe ndị mmadụ bịara ife Chineke nꞌụbọchị ahụ nọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nꞌihi na ọ bụ omenala na mgbe ọ bụla onye nchụaja banyere ịchụ ụdị aja a, ndị mmadụ ga-anọ nꞌezi na-ekpe ekpere.
Igbo 2006
Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.