Luke 1:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu.
Igbo 2006
Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.