Luke 1:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na nwanta ahụ ga-abụ onye dị ukwuu nꞌanya Chineke. Ọ gaghị emetụ mmanya ọ bụla aka, ọ gaghị aṅụkwa mmanya na-egbu egbu, nꞌihi na site nꞌafọ nne ya, Chineke ga-emejupụta ya na Mmụọ Nsọ.
Igbo 2006
N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.