Luke 1:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Zakaraya jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị ya, “Olee otu m ga-esi mata na ihe ị gwara m bụ eziokwu? Ị hụlanụ na abụrụla m agadi nwụnye m bụkwa agadi.”
Igbo 2006
Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”